Journal statistics
How to use the archive
When the cursor changes from an arrow to a pointing finger, it indicates a link that you may click on to select that item.
The blue buttons at the top can be selected to return to the overview or to run a search for specific information.
Most volumes have been split into two parts, each with separate articles. When you select a specific number, all of the articles will be listed with details of the author, date of publication, language and the size of the file that will be downloaded if you choose that option. Just click on the yellow "Download" button to transfer a copy of the article to your own computer or device.
- Language Family: Atlantic
- Topic #1: Sociolinguistics
Ụmị edemede
Nchọcha a na-enyocha etu ndị Igbo nke ndịda-ọwụwa anyanwụ Naịjirịa si ahụta na aghọta akụkụala ndị a na-eri eri n’ụwa ha. N’agbanyeghị na e nweela nchọcha metụtara nkọwa keomenala dịka o si metụta anụmanụ, akụkụ ahụ dị iche iche, nakwa ngwa ọdịmara omenala, elebabeghị etu ndị Igbo si akọwa akụkụala ndị a na-eri eri anya nke ọma. Ebumnuche nchọcha a bụ inyocha etu e si ahụta akụkụala ndị a na-eri eri n’etiti ndị Igbo, ịtụle nkọwa a na-enye akụkụala ndị a, na ileba anya etu nkọwa ndị ahụ si metụta agwa mmadụ, ọdịdị, maọbụ ejirimara n’ala Igbo. Site n’ịgbado ụkwụ n’atụtụ Lingwistiks Keomenala nke Sharifian, ọkachasị echemeche nkọwa keomenala site n’ịgbado ụkwụ na nhazi echiche keomenala, katigori keomenla na mbụrụ keomenala, nchọcha a nyochara etu mmata omenala na echiche si ahazi ntapịa ọdịmara ndị Igbo na-enye akụkụala. Sitekwa n’iji usoro nchọcha kwọlitetiv, a nakọtara njiatụle site na nsonye nakwa ajụjụọnụ. Nchọpụta gosiri na ndị Igbo nke ndịda-ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na-enwe nkọwa ụfọdụ gbasara akụkụala ndị a na-eri eri, ma jikọta ha na agwa mmadụ, ọdịdị, maọbụ ejirimara. Nchọcha gosipụtara na akụkụala ndị a na-eri eri anaghị arụ ọrụ naanị dịka okwu, ngwa ọrụ ugbo na nke ndozi ahụ, kama ha bụ ngwa echiche na eomenala ndị Igbo ji akọwa nhụrụụwa na agwa mmadụ. Nchọpụta na-egosi ọnọdụ akụkụala ndị a na-eri eri na nhazi ekereuche lingwistiks, echiche nakwa nkọwa keomenala gbasara mmadụ n’ala Igbo.